Psalms 53

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Mahalat. Abụ maskil Devid.

Nzuzu nke ndị na-emebi iwu

1Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya,
“Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.”
Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ụzọ ha niile bụkwa ihe arụ;
ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.

2Chineke sitere nʼeluigwe
na-ele ụmụ mmadụ anya,
ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta,
onye nke na-achọ Chineke.
3Onye ọbụla, nʼotu nʼotu ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ;
ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi,
ọ dịghị ọ bụladị otu onye.

4Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe?

Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri,
ha adịghị akpọkukwa Chineke.
5Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu,
ebe ọ dịghị ihe egwu na-adịghị.
Chineke fesasịrị ọkpụkpụ ndị niile megidere gị;
i mere ka ihere mee ha, nʼihi na Chineke ajụla ha.

6O, a sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta!
Mgbe Chineke ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha,
ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!
Copyright information for IboBIU